Jonah 1

Jona agbapụ ọsọ

1Okwu Onyenwe anyị bịakwutere Jona nwa Amitai, na-asị, 2“Bilie, gaa Ninive, bụ obodo ukwu ahụ, kwusaa okwu megide ya, nʼihi na ajọ omume ha abịarutela nʼihu m.”

3Ma Jona gbapụrụ ọsọ site nʼihu Onyenwe anyị chee ihu ya ije Tashish. O biliri jee Jopa, nʼebe ọ hụrụ ụgbọ mmiri nke na-aga Tashish. Ọ kwụrụ ụgwọ ije ụgbọ, banye isoro gaa Tashish ka o nwee ike gbapụ site nʼihu Onyenwe anyị.

4Ma Onyenwe anyị mere ka ifufe dị egwu malite ife nʼelu osimiri ahụ, ebili mmiri bidokwara na-amagharị, chọọ itiwasị ụgbọ mmiri ahụ. 5Mgbe ahụ, ndị niile na-arụ ọrụ nʼụgbọ ahụ tụrụ oke egwu, malite itiku chi ha. Ha malitekwara itufu ihe niile dị nʼụgbọ mmiri ahụ, ime ka ụgbọ ahụ dị mfe.

Ma nʼoge ihe ndị a na-eme, Jona nọrịị nʼala ala ụgbọ mmiri ahụ ebe o dinara ala na-arahụ ụra.
6Onyeisi ụgbọ jekwuru Jona sị ya, “Gịnị ka ị nọ nʼebe a na-eme, ị na-arahụ ụra? Bilie, kpọkuo chi gị, ma eleghị anya o nwere ike ileta anyị anya, meere anyị ebere, zọpụta anyị.”

7Mgbe ahụ, ndị nọ nʼụgbọ sịrịtara ibe ha, “Bịanụ ka anyị fee nza mata onye ihe ọjọọ dị otu a sị nʼaka ya bịakwasị anyị.” Ya mere, ha fere nza, nza ahụ a maa Jona. 8Nʼihi ya, ha sịrị ya, “Gwa anyị, onye mere ka ihe dị otu a bịakwasị anyị. Gịnị bụ ọrụ gị? Ebee ka i si bịa? Ị bụ onye obodo ebee? Ole agbụrụ i si na ya pụta?”

9Ọ sịrị, “Abụ m onye Hibru, na onye na-akpọ isiala nye Onyenwe anyị, bụ Chineke nke eluigwe, onye kere osimiri na ala akọrọ.”

10Egwu dị ukwuu tụrụ ụmụ nwoke ahụ, ha sịrị ya, “Gịnị ka i mere?” Nʼihi na ha matara na o si nʼihu Onyenwe anyị na-agbapụ ọsọ, nʼihi na ọ gwala ha rịị na ọ bụ otu o si dị.

11Ma ebili mmiri ahụ gara nʼihu na-amali nʼike nʼike. Nʼihi ya, ha sịrị, “Gịnị ka anyị ga-eme gị, nke ga-eme ka osimiri dajụọ?”

12Ọ gwara ha, “Bulienụ m tụnye nʼime osimiri. Nke a ga-emekwa ka ọ dajụọ. Nʼihi na amaara m na ọ bụ nʼihi m ka ebili mmiri ọjọọ a ji na-abịakwasị unu.”

13Kama, ndị ikom ahụ ji ike nyasie ụgbọ ahụ ichigharị ya laghachi nʼelu ala, ma ha enweghị ike. Nʼihi na oke osimiri ahụ na-amali elu karịa ka ọ dị na mbụ. 14Mgbe ahụ, ha tikuru Onyenwe anyị mkpu akwa sị, “Onyenwe anyị, biko ekwela ka anyị nwụọ nʼihi ọnwụ nwoke a. Biko, atụkwasịkwala ọbara nwoke a na-emeghị ihe ọjọọ nʼisi anyị, nʼihi na gị Onyenwe anyị emeela dịka i si chọọ.” 15Ya mere, ha buliri Jona elu tụnye ya nʼime osimiri ahụ, ebili mmiri ahụ dajụkwara. 16Mgbe nke a mere ndị ikom ahụ tụrụ egwu Onyenwe anyị nke ukwuu. Ha chụụrụ Onyenwe anyị aja, kwekwa ya nkwa dị iche iche.

Ekpere Jona

17Ma Onyenwe anyị akwadolarị otu azụ buru ibu ka o loo Jona. Ya mere, Jona nọrọ nʼafọ azụ ahụ ụbọchị atọ, ehihie na abalị.

Copyright information for IboBIU